7 Eprel 2023Mgbe ikpeazụ e tinyere ya ozi ọhụrụ 8 Eprel 2023
Akwụkwọ ozi onye na-ede akwụkwọ a ma ama n’ụwa bụ Chimamanda Adichie zigaara onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden apụtala bụrụ okwu akpụ n’ọnụ kemgbe ọ gbara n’ọha.
N’akwụkwọ ozi a, Adichie kwuru na ọ bụ ihe tụrụ ya n’anya na mba Amerịka toro usoro ntuliaka 2023 nke ọ chee bụ ihe usoro ya kpụrụ afọ n’ala.
Iji saa ya, Onyeisi ọrụ mgbasa ozi na achụmnta vootu Tinubu/Shettima kwuru:
“Onyeisiala Joe Biden, biko kpọnye ozi ahụ Chimamanda zitere gị maka ntuliaka Naịjirịa n’ọhịa mgbe o rute elu tebulu gị. Ihe ọ dere bụ ihe na-emeghị eme nke ọ chepụtara n’uche ya n’ihi onye agbụrụ ya bụ Peter Obi kpụrụ afọ n’ala”
Skip Twitter post, 1Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 1
Nke a gbara n’akara Twitter dịka ọ kesakwara ozi ndị ọzọ bụ nke ndị na-akatọ ozi Adichie nye Biden.
Otu n’ime ozi ya bụ nke bu aha Dele Alake onye bụ onyeisi nchepụta atụmatụ mgbasaozi achụmnta vootu Tinubu, ozi ya kwuru:
“Chimamanda tinyere ntụkwasịobi ya na mmeri Obi n’ihi na e nwere ndị buru amụma nke a site n’ịjụ ndị mmadụ ajụjụ mana ngụkọ ha na amụma ha achịtaghị aja n’ihi na ndị ha jụrụ ajụ tupu ha ebipụta mpụtara amụma ha egosighi n’uju etu echiche ndị niile nọ na Naịjịrịa dị.”
“Mkpọpụta mpụtara ibụ amụma ndị di etu a abụghị ihe na-enye mmadụ mmeri na ntuliaka. Cheta na e buru ọtụtụ amụmụa na Hilary Clinton ga-emeri ntuliaka mba Amerịka 2016. Donald Trump mechara mmerie nke a apụtaghị na ọchịchị onye kwuo uche ya mba Amerịka puru epu.”
Gịnị ka Adichie dere kpọm kwem?

Chimamanda Adichie zipụtara ozi n'izu a nye Joe Biden maka ekele mmerị gọọmentị mba Amerịka zịgara ndị Naịjirịa nakwa ekele ha kelere Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ọnwa Febụruwarị afọ 2023.
Ya bụ akwụkwọ ozi ebutela ọtụtụ ọkwu na Soshal Midia, lee ihe ndị gbara ọkpụrụ ọ gwara Biden na ya bụ akwụkwọ ozi.
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o gwara Biden
Ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ Chimamanda gwara Joe Biden
Kamgbe afọ 1999 ndị agha kwụsịrị ọchịchị, ndị Naijiria enweghị ntụkwasị obi ebe ntuliaka nọ. Ime ntuliaka ma kwado onwe gị maka mpụtara ntuliaka ahụ nke bụ aghụghọ nwere ka ọ dị.
Mahmood Yakubu bụ onyeisi ngalaba Independent National Electoral Commission (Inec) kwere ndị Naịjirịa nkwa na a ga-agụ vootu n'ihu ha, debanye ya n'akwụkwọ. see ya foto ma tibanye ya na sava n'ihu ọha niile.
Ndị mmadụ kelere ya n'ihi na nke a pụtara na ọnụ ọgụgụ vootu agaghịzị akarị ndị tụrụ vootu. Ntuliaka ga-egosi ihe ndị mmadụ chọrọ. Ndị Naịjirịa ga-ejisi aka ha họpụta onyr ga-abụ onyeisiala ha.
Na mgbede ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, ntụkwasị obi a kụrụ afọ n'ala. Ndị ọrụ Inec abịaghị n'oge, ụfọdụ ejighị akụrụngwa eji arụ ọrụ, e nwere mkpesa ọgbaaghara, a gbara egbe n'ebe a na-eme ntuliaka, ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa soro eyija ndị chọrọ ime ntụliaka. Onye ụweojii na Legọs nọrọ o nweghị ihe ọ mere dịka otu onye APC yiri ndị si otu agbụrụ egwu.
Yakubu emezughị ihe ọ kwere ndị Naịjirịa na nkwa, ezipụghị mpụtara ntuliaka n'oge dịka o siri kwuo. mpụtara ntuliaka ekweghị izipụ a sị na network bụ nsogbu kama otu nwannem gwara m na ọ nwere network na ekwentị ya.
Ihe ndị mmadụ sere dịka foto n'ekwe ntị ha abụghị ihe Inec kpọpụtara.
Oge ngụkọ ntuliaka, otuonye nnọchite anya otu patị na abụghị APC gwara Yakubu sị, " Ọ baghị uru na anyị na-aga n'ihu n'ihi e nwere ihe ndị na adabaghị. Ka anyị hazie ihe a nke ọma tupu anyị ebido". Kama Yukubu egeghị ya ntị.
Iwe na-ewe ndị mmadụ ọkachasị ndị ntoroọbịa. Iwe na akawanye njọ.
Ọ bụ ihe ịtụanya na ngalaba U.S State Department kelere Bola Ahmed Tinubu onye Inec kpọpụtara onye meriri ntụliaka e mere. Ọ bụ na ngalaba nyocha nke Amerịka amaghị ọrụ ha ọzọ. Obere nyocha ga-egosi ihe a dọrọ mmadụ niile anya.
Onyeisiala Biden, ebujm n'obi na ọbụghị otu echiche ka ị nwere. Kedụ etu mba Amerịka kwenyere n'usoro iwu ga-esi akwado onyeisiala ahọpụtara n'ụzọ iwu na-akwadoghị?
"Onyeisiala Biden, ikele mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjirịa na-emetọ etu ụwa si ahụ mba Amerịka dịka ndị bu ọchịchị onye kwuoi uche ya n'isi.Biko e werela ihe kwụ ọtọ tinye n'ụsoro na-akwụghị ọtọ.Ka mba Amerịka bụrụ ihe ha sị ha bụ"
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka akwụkwọ ozi a
Adamu Garba kwuru na Twitter ya na Adichie na-akọ akụkọ ifo maka na e meriri nwanna ya na ntuliaka.
Skip Twitter post, 2Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 2
Onye kpọrọ onwe ya Preach Love na Twitter kelere Chimamanda maka ị bụ olu ndị na-enweghị olu.
Skip Twitter post, 3Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 3
David Hundeyin kelere ya ma sị na ọ nọ n'ebe kwesịrị ekwesị maka akụkọ mere eme.
Skip Twitter post, 4Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 4
Onye kpọrọ onwe ya SportsDokita na Twitter kelere Chimamanda maka iji edemede ya emezu uche obi ha.
Skip Twitter post, 5Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 5
Reno Omokri, kwuru na Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye nkwado Peter Obi ma sị ka Joe Biden hapụ ige ya ntị.
Skip Twitter post, 6Hapụ Twitter ihe dị na ya?Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Nabata na gaa n’ihuWarning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.End of Twitter post, 6
ncG1vNJzZmivp6x7o67CZ5qopV%2BetKO7jpqpraGTobK0e8KrnqNpmq%2B7qH%2FPqA%3D%3D